1 Chronicles 5

Ụmụ ụmụ Ruben

1Ọkpara Izrel bụ Ruben. Ma nʼihi na ọ merụrụ ihe ndina nna ya site na idinakwuru nwunye nna ya, a napụrụ ya ọnọdụ ọkpara ya were ya nye ụmụ nwanne ya Josef mụtara. Nʼihi ya, akwụkwọ akụkọ usoro ọmụmụ ụmụ Izrel akpọghị Ruben ọkpara. 2Ọ bụ ezie na Juda dị ike karịa ụmụnna ya, bụrụkwa eziokwu na onyendu si na Juda pụta, maọbụ Josef ka e nyere oke ruuru ọkpara. 3Ruben, ọkpara Izrel mụrụ ndị ikom ndị a:

Hanok, na Palu, na Hezrọn, na Kami.
4Juel mụrụ
Shemaya, nna Gog,
Gog mụrụ Shimei.
5Shimei mụrụ Maịka,
Maịka amụọ Reaya. Reaya amụọ Baal.
6Baal mụrụ Beera, onye Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa dọtara nʼagha. Beera bụkwa onyendu ndị Ruben.
7Ndị ụmụnna ha dịka agbụrụ niile ha si dị, bụ ndị e depụtara aha ha dịka usoro ọmụmụ ha si dị;
Jeiel onyeisi, na Zekaraya,
8na Bela nwa Azaz nwa Shema, nwa Juel.

Ha nwere ebe obibi ha site nʼAroea ruo nʼugwu Nebo, rukwaa Baal-Meon.
9Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, nwekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ. Ọ bụkwa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼọnụ ọzara ruo nʼosimiri Yufretis ka ha na-azụ ha, nʼihi na anụ ụlọ ha nwere bara ụba na Gilead.

10Nʼoge Sọl bụ eze Izrel, ụmụ Ruben meriri ndị Haga nʼagha, bichie ala ha niile dị nʼọwụwa anyanwụ Gilead.

Ụmụ ụmụ Gad

11Ụmụ Gad bi nʼakụkụ ha site na Bashan ruo Saleka.

12Juel bụ onyendu na Bashan, Shafam na-esote ya, ya na Janai na Shafat.
13Ụmụnna ha, ndị bụ ndị ndu ikwu asaa a bụ,
Maikel, na Meshulam, na Sheba, na Jorai, na Jakan, na Zia, na Eba.
14Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Abihail, nwa Huri, nwa Jaroa, nwa Gilead, nwa Maikel, nwa Jehishai, nwa Jado, nwa Buz.
15Ahi nwa Abdiel, nwa Guni bụ onyeisi nʼetiti ụmụnna ya.

16Ndị Gad nwere ebe obibi na Gilead nʼime Bashan, na nʼobodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha bikwa nʼebe ahịhịa anụ ụlọ na-ata jupụtara na Sharọn ruo nʼebe oke ala ha kwụsịrị.

17E denyere aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nʼoge Jotam bụ eze Juda, na nʼoge Jeroboam bụ eze Izrel.

18Ndị Ruben na ndị Gad, na ọkara ebo Manase nwere iri puku mmadụ anọ na anọ na narị asaa na iri isii (44,760) ndị jikeere ije agha, ndị dị ike, ndị a zụrụ iji ọta na mma agha, na ụta ibu agha. 19Ha busoro ndị Haga, na Jetua, na Nafish na ndị Nodab agha. 20E nyeere ha aka ibuso ha agha, Chineke nyefere ndị Haga na ndị niile na-enyere ha aka nʼaka ha, nʼihi na ha kpọkuru ya nʼoge ọgụ ahụ. Ọ zara ekpere ha nʼihi na ha tụkwasịrị ya obi. 21Ha ji ike chịkọrọ anụ ụlọ ndị Haga, dị iri puku ịnyịnya kamel ise, narị puku atụrụ abụọ na iri puku ise, puku ịnyịnya ibu abụọ. Ha dọkpụkwara narị puku ndị mmadụ nʼagha. 22E gbukwara ọtụtụ ndị mmadụ nʼihi na agha ahụ bụ nke Chineke lụrụ nʼonwe ya. Ha bichiri ala ahụ tutu ruo mgbe a dọọrọ Izrel niile nʼagha.

Ọkara ebo Manase

23Ọkara ebo Manase dị ukwuu nʼọnụọgụgụ; ha nwere ebe obibi ha site nʼala Bashan ruo Baal-Hemon, ya bụ, ruo Senia, ugwu Hemon.

24Ndịisi ikwu ha niile bụ ndị a: Efaa, Ishi, Eliel, Azriel, Jeremaya, Hodavaya na Jadiel. Ndị a niile bụ dimkpa nʼagha, ndị a ma ama na ndịisi ezinaụlọ. 25Ma ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke nna nna ha. Kama ha merụrụ onwe ha site nʼife chi niile nke ndị bi nʼala ahụ na mbụ, bụ ndị Chineke lara nʼiyi nʼihu ha. 26Nʼihi nke a, Chineke nke Izrel kpaliri mmụọ Pul, bụ eze Asịrịa (ya bụ Tiglat-Pilesa
Tiglat-Pilesa bụkwa onye a na-akpọ Pul, hụ nke a nʼakwụkwọ 2Ez 15:19
eze ndị Asịrịa), ka o bilie megide ndị Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase, dọta ha nʼagha, buru ha gaa Hala, na Hoboa, na Hara na osimiri Gozan, ebe ha nọ ruo taa.

Copyright information for IboBIU